2 Ndị Eze 3

Ịlaisha sịrị, “Ebe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, bụ onye m na-efe, a si na ọ bụghị nsọpụrụ m nwere nʼebe Jehoshafat eze Juda nọ, agaraghị m atụpụrụ gị ọnụ maọbụ lee gị anya nʼihu.

2 Kings 3:14 (UKJV) And Elisha said, As the LORD of hosts lives, before whom I stand, surely, were it not that I regard the presence of Jehoshaphat the king of Judah, I would not look toward you, nor see you.

12Jehoshafat zara sị, “Okwu Onyenwe anyị dị nʼọnụ ya.” Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat, na eze Edọm, gakwuru ya.

13Ịlaisha zara eze Izrel sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ? Jekwuru ndị amụma nne gị na nna gị, jụta ha ase.” Eze Izrel zara sị ya, “Mba, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị kpọpụtara anyị bụ eze atọ nʼebe a, ka o were anyị nyefee nʼaka ndị Moab.”

14Ịlaisha sịrị, “Ebe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, bụ onye m na-efe, a si na ọ bụghị nsọpụrụ m nwere nʼebe Jehoshafat eze Juda nọ, agaraghị m atụpụrụ gị ọnụ maọbụ lee gị anya nʼihu.

15Ma ugbu a, kpọtaranụ m onye na-akpọ ụbọ.” Mgbe ọkpọ ụbọ ahụ malitere ịkpọ ụbọ ya, aka Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaisha.

16Ọ sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, aga m eme ka ndagwurugwu a jupụta nʼolulu mmiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.