21Nne ya kuuru ya rigoo nʼelu ụlọ ahụ, tọgbọ ya nʼelu ihe ndina ahụ onye nke Chineke ahụ na-edina, mechie ụzọ pụọ.
22O ziri ozi kpọọ di ya sị ya, “Biko, zitere m otu okorobịa na otu ịnyịnya ibu, ka m jekwuru onye Chineke ahụ. Aga m alọtakwa ọsịịsọ.”
23Ọ sịrị, “Gịnị mere i ji ejekwuru ya taa? Ọ bụghị Ọnwa ọhụrụ, ọ bụghịkwa ụbọchị izuike.” Ọ zara sị, “Udo dị.”
24Mgbe ahụ, ọ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ibu ahụ, nye nwokorobịa ahụ iwu sị ya, “Gbasie ọsọ ike. Akwụsịkwala ịgba ọsọ ma ọ bụghị mgbe m gwara gị kwụsị.”
25Ya mere, o buliri ije, gakwuru onye nke Chineke nʼugwu Kamel. Mgbe o lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, onye nke Chineke sịrị odibo ya bụ Gehazi, “Lee nwanyị Shunem ahụ.