2 Ndị Eze 4

Ya mere, o buliri ije, gakwuru onye nke Chineke nʼugwu Kamel. Mgbe o lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, onye nke Chineke sịrị odibo ya bụ Gehazi, “Lee nwanyị Shunem ahụ.

2 Kings 4:25 (UKJV) So she went and came unto the man of God to mount Carmel. And it came to pass, when the man of God saw her far off, that he said to Gehazi his servant, Behold, yonder is that Shunammite:

23Ọ sịrị, “Gịnị mere i ji ejekwuru ya taa? Ọ bụghị Ọnwa ọhụrụ, ọ bụghịkwa ụbọchị izuike.” Ọ zara sị, “Udo dị.”

24Mgbe ahụ, ọ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ibu ahụ, nye nwokorobịa ahụ iwu sị ya, “Gbasie ọsọ ike. Akwụsịkwala ịgba ọsọ ma ọ bụghị mgbe m gwara gị kwụsị.”

25Ya mere, o buliri ije, gakwuru onye nke Chineke nʼugwu Kamel. Mgbe o lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, onye nke Chineke sịrị odibo ya bụ Gehazi, “Lee nwanyị Shunem ahụ.

26Gbara ọsọ gaa zute ya jụọ ya sị ya, ‘Ọ dịkwa mma? Dị gị ọ nọkwa nʼudo? Nwa gị ọ nọkwa nʼudo?’ ” Mgbe Gehazi zutere ya jụọ ajụjụ ndị a, nwanyị ahụ zara Gehazi sị ya, “E, anyị niile nọ nʼudo, ihe niile na-aga nke ọma.”

27Ma mgbe ọ bịakwutere onye nke Chineke, ọ dara nʼala nʼihu ya, jide ya nʼụkwụ ya abụọ. Gehazi bịaruru nso inupu ya, ma onyeozi Chineke sịrị ya, “Hapụ ya aka, nʼihi na ọ dị ihe na-enye ya nsogbu nʼime mmụọ ya, ma Onyenwe anyị zonarịrị m ya, ọ gwaghịkwa m ihe mere.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.