2 Ndị Eze 4

Mgbe Ịlaisha rutere nʼụlọ ahụ, ọ hụrụ ka nwantakịrị ahụ nwụrụ anwụ dina nʼelu ihe ndina ya.

2 Kings 4:32 (UKJV) And when Elisha was come into the house, behold, the child was dead, and laid upon his bed.

30Ma nne nwantakịrị ahụ zara sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị laa.” Ịlaisha biliri soro ya bido ịla nʼụlọ ya.

31Ma Gehazi butere ụzọ rute nʼụlọ ahụ, were mkpanaka ahụ tụkwasị nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ, ma nke a emeghị ka nwantakịrị ahụ teta ma ọ bụkwanụ kuo ume. Ya mere, Gehazi laghachiri izute Ịlaisha, gwa ya sị, “Nwata ahụ etetaghị.”

32Mgbe Ịlaisha rutere nʼụlọ ahụ, ọ hụrụ ka nwantakịrị ahụ nwụrụ anwụ dina nʼelu ihe ndina ya.

33Ọ banyere nʼime ọnụụlọ ahụ, mechibido ha abụọ ụzọ, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị.

34Emesịa, ọ makpuuru nʼelu nwantakịrị ahụ, tụkwasị ọnụ ya nʼọnụ nwantakịrị ahụ, na anya ya abụọ na nke nwantakịrị ahụ, na aka ya abụọ na nke ya. Mgbe o si otu a dinara nʼelu nwantakịrị ahụ, ahụ nwantakịrị ahụ malitere ikpo ọkụ ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.