29Ịlaisha sịrị Gehazi, “Ngwa, were ihe ike nʼukwu jikọta uwe mwụda gị, werekwa mkpanaka m nʼaka gị, bilie gaa Shunem. Mgbe ị na-aga ekelekwala onye ọbụla ekele. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ekelee gị, azala ekele ya. Gaa nʼụlọ ahụ. I ruo, tụkwasị mkpanaka m nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ.”
30Ma nne nwantakịrị ahụ zara sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị laa.” Ịlaisha biliri soro ya bido ịla nʼụlọ ya.
31Ma Gehazi butere ụzọ rute nʼụlọ ahụ, were mkpanaka ahụ tụkwasị nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ, ma nke a emeghị ka nwantakịrị ahụ teta ma ọ bụkwanụ kuo ume. Ya mere, Gehazi laghachiri izute Ịlaisha, gwa ya sị, “Nwata ahụ etetaghị.”
32Mgbe Ịlaisha rutere nʼụlọ ahụ, ọ hụrụ ka nwantakịrị ahụ nwụrụ anwụ dina nʼelu ihe ndina ya.
33Ọ banyere nʼime ọnụụlọ ahụ, mechibido ha abụọ ụzọ, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị.