2 Ndị Eze 5

Abana na Fapa, bụ osimiri dị na Damaskọs, ha adịghị mma karịa mmiri Izrel niile? Ọ bụ na m enweghị ike ịsa ahụ nʼime ha ma dị ọcha.” Ọ tụgharịrị jiri ọnụma pụọ.

2 Kings 5:12 (UKJV) Are not Abana and Pharpar, rivers of Damascus, better than all the waters of Israel? may I not wash in them, and be clean? So he turned and went away in a rage.

10Ịlaisha zigara onyeozi ya nke bịara zie sị ya, “Jee saa ahụ gị ugboro asaa nʼosimiri Jọdan. I mee nke a, ekpenta ahụ ga-esi nʼakụkụ ahụ gị niile pụọ. Ị ga-adịkwa ọcha.”

11Ma Neeman were iwe nke ukwuu tụgharịa bido ịlaghachi ebe o si bịa. Mgbe ọ na-ala, ọ na-ekwu na-asị, “Echere m na ọ ga-apụkwute m, guzo, kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya, fufee aka ya nʼebe ahụ ọrịa m dị, gwọọ m ọrịa ekpenta m.

12Abana na Fapa, bụ osimiri dị na Damaskọs, ha adịghị mma karịa mmiri Izrel niile? Ọ bụ na m enweghị ike ịsa ahụ nʼime ha ma dị ọcha.” Ọ tụgharịrị jiri ọnụma pụọ.

13Ma ndị ozi Neeman jekwuru ya sị ya, “Nna anyị, a sị na ọ bụ ihe sịrị ike nke ukwuu ka onye amụma ahụ gwara gị sị gị mee, ị garaghị eme ya? Ma ihe ọ sị gị mee bụ naanị ‘Gaa saa ahụ gị ka ị dị ọcha.’ ”

14Ya mere, ọ gara sụnye onwe ya nʼime osimiri Jọdan ugboro asaa, dịka onye nke Chineke gwara ya. Anụ ahụ ya lọghachiri dị ọcha ka anụ ahụ nwantakịrị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.