2 Ndị Eze 5

Ya mere, ọ gara sụnye onwe ya nʼime osimiri Jọdan ugboro asaa, dịka onye nke Chineke gwara ya. Anụ ahụ ya lọghachiri dị ọcha ka anụ ahụ nwantakịrị.

2 Kings 5:14 (UKJV) Then went he down, and dipped himself seven times in Jordan, according to the saying of the man of God: and his flesh came again like unto the flesh of a little child, and he was clean.

12Abana na Fapa, bụ osimiri dị na Damaskọs, ha adịghị mma karịa mmiri Izrel niile? Ọ bụ na m enweghị ike ịsa ahụ nʼime ha ma dị ọcha.” Ọ tụgharịrị jiri ọnụma pụọ.

13Ma ndị ozi Neeman jekwuru ya sị ya, “Nna anyị, a sị na ọ bụ ihe sịrị ike nke ukwuu ka onye amụma ahụ gwara gị sị gị mee, ị garaghị eme ya? Ma ihe ọ sị gị mee bụ naanị ‘Gaa saa ahụ gị ka ị dị ọcha.’ ”

14Ya mere, ọ gara sụnye onwe ya nʼime osimiri Jọdan ugboro asaa, dịka onye nke Chineke gwara ya. Anụ ahụ ya lọghachiri dị ọcha ka anụ ahụ nwantakịrị.

15Mgbe ahụ, Neeman na ndị niile ya na ha so laghachikwutere onye nke Chineke. O guzoro nʼihu ya sị, “Ugbu a amatala m na ọ dịghị Chineke ọzọ dị nʼụwa niile ma ọ bụghị naanị nʼIzrel. Ya mere, biko, nara onyinye a site nʼaka ohu gị.”

16Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye m na-ejere ozi, agaghị m ana gị ihe ọbụla.” Ma Neeman rịọrọ ya arịrịọ ka ọ nara ya, ma ọ jụrụ ajụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.