1Ụmụ ndị amụma gwara Ịlaisha okwu sị, “Lee, ebe a anyị bi nʼihu gị dị oke nta karịa.
2Ya mere, ka anyị gaa nʼakụkụ Jọdan gbute osisi anyị ga-eji wuo ụlọ ebe anyị ga-ebi.” Ọ sịrị ha, “Meenụ ka unu kwuru.”
3Ma otu onye nʼime ha rịọrọ ya sị, “Biko, nna anyị ukwu, soronụ anyị.” O kwenyere na ọ ga-eso ha.
4O sonyekwara ha. Mgbe ha bịaruru nʼakụkụ Jọdan, ha malitere igbutu osisi.