23Ya mere, ọ kwadooro ha oke oriri dị ukwuu, mgbe ha riri, ṅụkwaa, o zilagara ha, ha lakwuuru nna ha ukwu. Site nʼoge ahụ gaa nʼihu, ndị otu Aram na-apụnara mmadụ ihe kwusịrị inye nsogbu nʼoke ala ndị Izrel.
24Ma mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ben-Hadad, eze Aram, chịkọtara ndị agha ya niile pụta bịa gbaa Sameria gburugburu.
25Nʼihi nke a, oke ụnwụ dara nʼobodo Sameria. Nri kọrọ nʼala ahụ ruo na e bidoro ire otu isi ịnyịnya ibu iri shekel ọlaọcha asatọ. E rekwara nsị nduru shekel ise.
26Mgbe eze Izrel na-agafe nʼelu mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu, otu nwanyị kpọkuru ya sị ya, “Nyere m aka, onyenwe m eze.”
27Ma eze zara sị ya, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekweghị inyere gị aka, ebee ka m ga-esi nwetara gị inyeaka? Ọ bụ site nʼebe ịzọcha ọka? Ka ọ bụ nʼebe ịzọcha mmanya vaịnị?”