2 Ndị Eze 7

Mgbe ndị ekpenta ahụ rutere ogige ndị agha ndị Siria, ha banyere nʼime otu ụlọ rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ dị nʼime ya. Ha chịịrị ọlaọcha na ọlaedo na uwe ọma niile dị nʼime ya gaa zoo ha. Ọzọkwa, ha lọghachiri banye nʼụlọ ọzọ kwakọrọ ụfọdụ ihe dị nʼime ya gaa zoo.

2 Kings 7:8 (UKJV) And when these lepers came to the uttermost part of the camp, they went into one tent, and did eat and drink, and carried thence silver, and gold, and raiment, and went and hid it; and came again, and entered into another tent, and carried thence also, and went and hid it.

6nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ndị Aram nụ ụzụ ụgbọ agha na nke ịnyịnya, na nke usuu ndị agha. Nke a mere ka onye ọbụla gwa ibe ya sị, “Lee, eze ndị Izrel egoola ndị agha ndị Het, na ndị eze Ijipt ibuso anyị agha.”

7Ha biliri gbapụ ọsọ nʼabalị ahụ, hapụ ụlọ ikwu ha niile, na ịnyịnya ha niile, na ịnyịnya ibu ha niile, na ihe niile otu o si dịrị, ma gbapụ ọsọ ndụ.

8Mgbe ndị ekpenta ahụ rutere ogige ndị agha ndị Siria, ha banyere nʼime otu ụlọ rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ dị nʼime ya. Ha chịịrị ọlaọcha na ọlaedo na uwe ọma niile dị nʼime ya gaa zoo ha. Ọzọkwa, ha lọghachiri banye nʼụlọ ọzọ kwakọrọ ụfọdụ ihe dị nʼime ya gaa zoo.

9Ma mgbe ahụ ha sịrịtara onwe ha, “Ihe anyị na-eme ezighị ezi. Taa bụ ụbọchị oziọma, ma lee ka anyị na-agba nkịtị. Ọ bụrụ na anyị echere ruo ìhè ụtụtụ, a ga-achọpụta ajọọ omume anyị. Ugbu a bịanụ, ka anyị gaa gwa ndị nọ nʼụlọeze, ihe anyị hụrụ.”

10Ya mere, ha gara kpọkuo ndị nche ọnụ ụzọ obodo ahụ, gwa ha sị, “Anyị banyere nʼogige ndị agha Aram, o nweghị mmadụ ọbụla nọ nʼebe ahụ, ọ dịghị olu mmadụ anyị nụrụ nʼebe ahụ, naanị ịnyịnya na ịnyịnya ibu elibere nʼosisi, na ụlọ ikwu ha a hapụrụ dịka ha dị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.