25Mgbe ahụ, Jehu sịrị Bidka, bụ onyeisi agha ya, “Bulie ya, tụba ya nʼubi Nebọt onye Jezril. Chetakwa na mụ na gị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya, anyị abụọ, na-eso nna ya Ehab, mgbe Onyenwe anyị kwuru okwu amụma a megide ya.
26‘Nʼezie, ahụrụ m ọbara Nebọt na ọbara ụmụ ya ndị ikom ụnyaahụ, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼihi ya, aghaghị m ime ka ị kwụghachi ụgwọ ọbara ha nʼala ubi a.’ Ugbu a, bulie ya tụba ya nʼala ubi a dị ka okwu Onyenwe anyị si dị.”
27Mgbe Ahazaya eze Juda, hụrụ ihe mere, ọ gbaara ọsọ na-agbago nʼụzọ Bet Hagan. Ma Jehu chụsoro ya, na-eti mkpu sị, “Gbukwuonụ ya.” Ha merụrụ ya ahụ ka ọ nọ nʼụgbọ agha ya, nʼụzọ ịga Gua, nso Ibleam, ọ gbara ọsọ ga Megido ebe ọ nọ nwụọ.
28Ndị ohu ya ji ụgbọ agha bịa buru ozu ya bubata ya na Jerusalem, lie ya nʼebe e liri nna nna ya ha, nʼobodo Devid.
29Nʼafọ iri na otu nke ọchịchị Joram nwa Ehab, ka Ahazaya malitere ịbụ eze Juda.