2 Ndị Eze 9

Nʼafọ iri na otu nke ọchịchị Joram nwa Ehab, ka Ahazaya malitere ịbụ eze Juda.

2 Kings 9:29 (UKJV) And in the eleventh year of Joram the son of Ahab began Ahaziah to reign over Judah.

27Mgbe Ahazaya eze Juda, hụrụ ihe mere, ọ gbaara ọsọ na-agbago nʼụzọ Bet Hagan. Ma Jehu chụsoro ya, na-eti mkpu sị, “Gbukwuonụ ya.” Ha merụrụ ya ahụ ka ọ nọ nʼụgbọ agha ya, nʼụzọ ịga Gua, nso Ibleam, ọ gbara ọsọ ga Megido ebe ọ nọ nwụọ.

28Ndị ohu ya ji ụgbọ agha bịa buru ozu ya bubata ya na Jerusalem, lie ya nʼebe e liri nna nna ya ha, nʼobodo Devid.

29Nʼafọ iri na otu nke ọchịchị Joram nwa Ehab, ka Ahazaya malitere ịbụ eze Juda.

30Mgbe Jezebel nụrụ na Jehu abịaruola Jezril, ọ banyere nʼụlọ ya, tee uri nʼanya abụọ, dozie agịrị isi ya, pụta bịa nọdụ ala nʼakụkụ oghereikuku, site nʼebe ahụ na-elepụ anya nʼezi.

31Mgbe Jehu batara nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze, Jezebel kpọkuru ya sị, “Ị bịara nʼudo, gị Zimri, gị onye gburu nna gị ukwu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.