2 Ndị Eze 9

Jehu banyere nọ nʼime ụlọeze rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ. Emesịa, o nyere iwu sị, “Leenụ nwanyị a a bụrụ ọnụ; burunu ya gaa lie ya, nʼihi na ọ bụ ada eze.”

2 Kings 9:34 (UKJV) And when he was come in, he did eat and drink, and said, Go, see now this cursed woman, and bury her: for she is a king's daughter.

32Jehu leliri anya elu lee anya na oghereikuku tie mkpu sị, “Onye dịnyeere m?” Onozi abụọ maọbụ atọ na-eje ozi nʼụlọeze lepụtara anya lee ya anya.

33Jehu nyere ha iwu sị ha, “Tụdanụ ya nʼala.” Ya mere, ha si nʼelu ebe ahụ tụda ya nʼala. Mgbe ọ daruru ala, ọbara ya fesasịrị nʼahụ mgbidi ụlọ na nʼahụ ịnyịnya ndị ji ụkwụ ha zọjaa ya.

34Jehu banyere nọ nʼime ụlọeze rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ. Emesịa, o nyere iwu sị, “Leenụ nwanyị a a bụrụ ọnụ; burunu ya gaa lie ya, nʼihi na ọ bụ ada eze.”

35Mgbe ha pụtara ili ya, ọ bụ naanị okpokoro isi ya na ọkpụkpụ ụkwụ ya abụọ, na aka ya abụọ ka ha hụrụ. Ha ahụkwaghị anụ ahụ ya.

36Ha laghachiri gwa Jehu ihe ha hụrụ. Ọ zara sị ha, “Nke a bụ okwu Onyenwe anyị, nke o kwuru site nʼọnụ ohu ya Ịlaịja onye Tishbe sị: ‘Nʼala ubi dị na Jezril ka nkịta ga-anọ rie anụ ahụ Jezebel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.