33Jehu nyere ha iwu sị ha, “Tụdanụ ya nʼala.” Ya mere, ha si nʼelu ebe ahụ tụda ya nʼala. Mgbe ọ daruru ala, ọbara ya fesasịrị nʼahụ mgbidi ụlọ na nʼahụ ịnyịnya ndị ji ụkwụ ha zọjaa ya.
34Jehu banyere nọ nʼime ụlọeze rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ. Emesịa, o nyere iwu sị, “Leenụ nwanyị a a bụrụ ọnụ; burunu ya gaa lie ya, nʼihi na ọ bụ ada eze.”
35Mgbe ha pụtara ili ya, ọ bụ naanị okpokoro isi ya na ọkpụkpụ ụkwụ ya abụọ, na aka ya abụọ ka ha hụrụ. Ha ahụkwaghị anụ ahụ ya.
36Ha laghachiri gwa Jehu ihe ha hụrụ. Ọ zara sị ha, “Nke a bụ okwu Onyenwe anyị, nke o kwuru site nʼọnụ ohu ya Ịlaịja onye Tishbe sị: ‘Nʼala ubi dị na Jezril ka nkịta ga-anọ rie anụ ahụ Jezebel.
37Ozu Jezebel ga-adị ka unyi nʼala ubi dị na Jezril, ruo na mmadụ enweghị ike ikwupụta sị, Nke a bụ Jezebel.’ ”