2 Pita 2

Nʼanya ukwu ha, ndị nkuzi ụgha ndị a ga-eji okwu nrafu rigbuo unu nʼuru. Site na mgbe ochie, onye ga-ekpe ha ikpe dị njikere. Onye ga-ala ha nʼiyi anaghị arahụ ụra.

2 Peter 2:3 (UKJV) And through covetousness shall they with feigned words make merchandise of you: whose judgment now of a long time lingers not, and their damnation slumbers not.

1Ma na mgbe ochie ahụ kwa, e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nʼetiti ha, dịka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nʼetiti unu. Ndị a ga-esite na nzuzo na-ewebata ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nʼiyi, ha ga-agọnarị ọ bụladị onye kachasị ihe niile, bụ Onyenwe, onye gbapụtara ha. Ha na-eweta ịla nʼiyi na mberede, na-atụkwasị onwe ha nʼisi.

2Ya mere, ọtụtụ mmadụ ga-esoro ndụ rụrụ arụ ha na-ebi, nʼihi ha ga-ekwutọkwa ụzọ nke eziokwu ahụ.

3Nʼanya ukwu ha, ndị nkuzi ụgha ndị a ga-eji okwu nrafu rigbuo unu nʼuru. Site na mgbe ochie, onye ga-ekpe ha ikpe dị njikere. Onye ga-ala ha nʼiyi anaghị arahụ ụra.

4Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama o weere ha kpọchie nʼime ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ na-eche ụbọchị ikpe ahụ.

5Ọ bụrụkwa na o mereghị ndị ụwa nke mbụ ebere mgbe o mere ka uju mmiri bịakwasị ndị bi na ya na-amaghị Chineke, kama ọ zọpụtara naanị Noa bụ onye kwusara ezi omume na mmadụ asaa ndị ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.