2 Pita 2

Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama o weere ha kpọchie nʼime ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ na-eche ụbọchị ikpe ahụ.

2 Peter 2:4 (UKJV) For if God spared not the angels that sinned, but cast them down to hell, and delivered them into chains of darkness, to be reserved unto judgment;

2Ya mere, ọtụtụ mmadụ ga-esoro ndụ rụrụ arụ ha na-ebi, nʼihi ha ga-ekwutọkwa ụzọ nke eziokwu ahụ.

3Nʼanya ukwu ha, ndị nkuzi ụgha ndị a ga-eji okwu nrafu rigbuo unu nʼuru. Site na mgbe ochie, onye ga-ekpe ha ikpe dị njikere. Onye ga-ala ha nʼiyi anaghị arahụ ụra.

4Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama o weere ha kpọchie nʼime ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ na-eche ụbọchị ikpe ahụ.

5Ọ bụrụkwa na o mereghị ndị ụwa nke mbụ ebere mgbe o mere ka uju mmiri bịakwasị ndị bi na ya na-amaghị Chineke, kama ọ zọpụtara naanị Noa bụ onye kwusara ezi omume na mmadụ asaa ndị ọzọ.

6Ọ bụrụ na ọ mara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe site nʼiwere ọkụ rechapụ ha, mee ha ihe ịmaatụ banyere ihe gaje ịbịakwasị ndị na-amaghị Chineke;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.