2 Pita 2

Ọ bụrụ na ọ mara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe site nʼiwere ọkụ rechapụ ha, mee ha ihe ịmaatụ banyere ihe gaje ịbịakwasị ndị na-amaghị Chineke;

2 Peter 2:6 (UKJV) And turning the cities of Sodom and Gomorrha into ashes condemned them with an overthrow, making them an example unto those that after should live ungodly;

4Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama o weere ha kpọchie nʼime ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ na-eche ụbọchị ikpe ahụ.

5Ọ bụrụkwa na o mereghị ndị ụwa nke mbụ ebere mgbe o mere ka uju mmiri bịakwasị ndị bi na ya na-amaghị Chineke, kama ọ zọpụtara naanị Noa bụ onye kwusara ezi omume na mmadụ asaa ndị ọzọ.

6Ọ bụrụ na ọ mara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe site nʼiwere ọkụ rechapụ ha, mee ha ihe ịmaatụ banyere ihe gaje ịbịakwasị ndị na-amaghị Chineke;

7ọ bụrụkwa na ọ napụtara Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ nke ndị na-emebi iwu wutere

8(nʼihi na nwoke ezi omume ahụ nke na-ebi nʼetiti ha ụbọchị niile, ehihie na abalị, bụ onye eji ọrụ mmebi iwu niile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, mekpaa mkpụrụobi ezi omume ya ahụ).

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.