2 Pita 2

(nʼihi na nwoke ezi omume ahụ nke na-ebi nʼetiti ha ụbọchị niile, ehihie na abalị, bụ onye eji ọrụ mmebi iwu niile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, mekpaa mkpụrụobi ezi omume ya ahụ).

2 Peter 2:8 (UKJV) (For that righteous man dwelling among them, in seeing and hearing, vexed his righteous soul from day to day with their unlawful deeds;)

6Ọ bụrụ na ọ mara obodo Sọdọm na Gọmọra ikpe site nʼiwere ọkụ rechapụ ha, mee ha ihe ịmaatụ banyere ihe gaje ịbịakwasị ndị na-amaghị Chineke;

7ọ bụrụkwa na ọ napụtara Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ nke ndị na-emebi iwu wutere

8(nʼihi na nwoke ezi omume ahụ nke na-ebi nʼetiti ha ụbọchị niile, ehihie na abalị, bụ onye eji ọrụ mmebi iwu niile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, mekpaa mkpụrụobi ezi omume ya ahụ).

9Ọ bụrụ na ọ dị otu a, Onyenwe anyị maara otu o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site nʼọnwụnwa niile gbara ha gburugburu. Ọ makwaara edebe ndị ajọ omume nʼahụhụ, tutu ruo ụbọchị ikpe ahụ.

10Nke a bụ eziokwu banyere ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ emerụrụ emerụ nke anụ ahụ mmehie ha, na-eledakwa ike ọchịchị anya. Ndị nwere anya ike ma jupụtakwa na mpako. Ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.