17Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan.
18O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha.
19“Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu. Lee ka ndị bụ dike si daa!
20“Ekwutela ya na Gat. Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn. Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ. Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ.
21“Unu ugwu Gilboa, ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu. Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu. Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta ndị dị ike. E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ.