23Sọl na Jonatan, na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara. Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha. Ha dị gara gara karịa ugo. Ha dị ike karịa ọdụm.
24“Ụmụada Izrel, kwaaranụ Sọl akwa. Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma. Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma.
25“Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha. E gbuola Jonatan nʼelu ugwu;
26ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m nʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m. Ịhụnanya i nwere nʼebe m nọ dị omimi karịa ịhụnanya ndị nwanyị.
27“Lee ka ndị dị ike si daa! Ngwa agha niile abụrụla ihe lara nʼiyi!”