2 Samuel 1

“Ụmụada Izrel, kwaaranụ Sọl akwa. Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma. Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma.

2 Samuel 1:24 (UKJV) All of you daughters of Israel, weep over Saul, who clothed you in scarlet, with other delights, who put on ornaments of gold upon your apparel.

22“Site nʼọbara ndị e gburu egbu, site nʼanụ ahụ ndị dị ike. Ụta Jonatan alọghachighị azụ. Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi.

23Sọl na Jonatan, na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara. Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha. Ha dị gara gara karịa ugo. Ha dị ike karịa ọdụm.

24“Ụmụada Izrel, kwaaranụ Sọl akwa. Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma. Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma.

25“Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha. E gbuola Jonatan nʼelu ugwu;

26ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m nʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m. Ịhụnanya i nwere nʼebe m nọ dị omimi karịa ịhụnanya ndị nwanyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.