11“Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ si nʼezinaụlọ gị bilie megide gị. Nʼihu gị ka m ga-eduru ndị nwunye gị dunye otu onye dị gị nnọọ nso, ya na ha ga-edinakọ nʼehihie ọcha, nʼihu ndị Izrel niile.
12I mere mmehie gị na nzuzo, ma aga m eme nke a na mbara, nʼihu Izrel niile.’ ”
13Mgbe ahụ, Devid sịrị Netan, “Emehiela m megide Onyenwe anyị.” Netan zara sị ya, “Onyenwe anyị nʼonwe ya agbagharakwala gị mmehie gị, ị gaghị anwụ.
14Ma nʼihi na i meela ka ndị iro Onyenwe anyị nwe ohere ikwulu na ilelị ya anya, nwa nwoke ahụ amụụrụ gị ga-anwụ.”
15Mgbe Netan lara, Onyenwe anyị mere ka nwantakịrị ahụ nwunye Ụraya mụụrụ Devid daa ọrịa.