12I mere mmehie gị na nzuzo, ma aga m eme nke a na mbara, nʼihu Izrel niile.’ ”
13Mgbe ahụ, Devid sịrị Netan, “Emehiela m megide Onyenwe anyị.” Netan zara sị ya, “Onyenwe anyị nʼonwe ya agbagharakwala gị mmehie gị, ị gaghị anwụ.
14Ma nʼihi na i meela ka ndị iro Onyenwe anyị nwe ohere ikwulu na ilelị ya anya, nwa nwoke ahụ amụụrụ gị ga-anwụ.”
15Mgbe Netan lara, Onyenwe anyị mere ka nwantakịrị ahụ nwunye Ụraya mụụrụ Devid daa ọrịa.
16Devid rịọrọ Chineke arịrịọ banyere nwantakịrị ahụ. O buru ọnụ, dinaa nʼala efu abalị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị.