2 Samuel 12

Devid rịọrọ Chineke arịrịọ banyere nwantakịrị ahụ. O buru ọnụ, dinaa nʼala efu abalị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị.

2 Samuel 12:16 (UKJV) David therefore besought God for the child; and David fasted, and went in, and lay all night upon the earth.

14Ma nʼihi na i meela ka ndị iro Onyenwe anyị nwe ohere ikwulu na ilelị ya anya, nwa nwoke ahụ amụụrụ gị ga-anwụ.”

15Mgbe Netan lara, Onyenwe anyị mere ka nwantakịrị ahụ nwunye Ụraya mụụrụ Devid daa ọrịa.

16Devid rịọrọ Chineke arịrịọ banyere nwantakịrị ahụ. O buru ọnụ, dinaa nʼala efu abalị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị.

17Emesịa, ndị okenye ụlọ ya rịọrọ Devid ka o bilie rie nri, ma ọ jụrụ iri ihe ọbụla.

18Nʼụbọchị nke asaa, nwantakịrị ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, ndị na-ejere Devid ozi tụrụ egwu otu ha ga-esi gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla. Nʼihi na ha kwuru nʼime onwe ha sị, “Mgbe nwantakịrị ahụ ka dị ndụ, anyị gwara ya okwu ma o geghị anyị ntị. Anyị ga-esi aṅaa gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla? O nwere ike imerụ onwe ya ahụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.