22Devid zara ha sị, “Eburu m ọnụ, kwaakwa akwa mgbe nwa ahụ nọ ndụ, nʼihi na ekwuru m sị, ‘ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-enwe ọmịiko nʼebe m nọ mee ka nwa ahụ dị ndụ.’
23Ma ugbu a ọ nwụrụ, gịnịkwa ka m nwere dịka uru ibu ọnụ ọzọ? M pụrụ ime ka ọ dị ndụ ọzọ? Aga m alakwuru ya, ma ọ gaghị alaghachikwutekwa m.”
24Devid kasiri Batsheba nwunye ya obi, emesịa, mgbe ya na ya dinakọrọ, ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke onye ha kpọrọ aha ya Solomọn. Ma Onyenwe anyị hụrụ nwantakịrị ahụ nʼanya.
25O zigara ozi site nʼaka Netan, onye amụma, ka a gụọ ya Jedidaya nʼihi Onyenwe anyị.
26Nʼoge a, Joab busoro Raba obodo ndị Amọn agha dọta isi obodo eze ha nʼagha.