21O juru ndị na-ejere ya ozi anya, nʼihi ya ha jụrụ ya ajụjụ si, “Gịnị mere i ji eme omume dị otu a? Mgbe nwantakịrị ahụ nọ ndụ, i buru ọnụ, kwaakwa akwa, ma ugbu a, nwa ahụ anwụọla, ị kwụsịla iru ụjụ. Ugbu a, ị biliela na-erikwa nri.”
22Devid zara ha sị, “Eburu m ọnụ, kwaakwa akwa mgbe nwa ahụ nọ ndụ, nʼihi na ekwuru m sị, ‘ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-enwe ọmịiko nʼebe m nọ mee ka nwa ahụ dị ndụ.’
23Ma ugbu a ọ nwụrụ, gịnịkwa ka m nwere dịka uru ibu ọnụ ọzọ? M pụrụ ime ka ọ dị ndụ ọzọ? Aga m alakwuru ya, ma ọ gaghị alaghachikwutekwa m.”
24Devid kasiri Batsheba nwunye ya obi, emesịa, mgbe ya na ya dinakọrọ, ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke onye ha kpọrọ aha ya Solomọn. Ma Onyenwe anyị hụrụ nwantakịrị ahụ nʼanya.
25O zigara ozi site nʼaka Netan, onye amụma, ka a gụọ ya Jedidaya nʼihi Onyenwe anyị.