19Mgbe Devid hụrụ na ha na-ekwurịta okwu nʼetiti onwe ha na nzuzo; ọ matara na nwa ahụ anwụọla. Ọ jụrụ ha sị, “Nwata ahụ ọ nwụọla?” Ha zara sị ya, “E, ọ nwụọla!”
20Mgbe ahụ, Devid sitere nʼala ebe o dina, bilie, saa ahụ, gbanwee uwe ya, baa nʼụlọ Onyenwe anyị, kpọọrọ ya isiala. Ọ lọghachiri nʼụlọ ya nye iwu ka e wetara ya ihe oriri. O rikwara nri.
21O juru ndị na-ejere ya ozi anya, nʼihi ya ha jụrụ ya ajụjụ si, “Gịnị mere i ji eme omume dị otu a? Mgbe nwantakịrị ahụ nọ ndụ, i buru ọnụ, kwaakwa akwa, ma ugbu a, nwa ahụ anwụọla, ị kwụsịla iru ụjụ. Ugbu a, ị biliela na-erikwa nri.”
22Devid zara ha sị, “Eburu m ọnụ, kwaakwa akwa mgbe nwa ahụ nọ ndụ, nʼihi na ekwuru m sị, ‘ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-enwe ọmịiko nʼebe m nọ mee ka nwa ahụ dị ndụ.’
23Ma ugbu a ọ nwụrụ, gịnịkwa ka m nwere dịka uru ibu ọnụ ọzọ? M pụrụ ime ka ọ dị ndụ ọzọ? Aga m alakwuru ya, ma ọ gaghị alaghachikwutekwa m.”