1Ya mere, Onyenwe anyị zigara Netan ka o jekwuru Devid. Mgbe Netan bịakwutere Devid, ọ kọọrọ ya akụkọ a, “E nwere ndị ikom abụọ bi nʼotu obodo, otu bụ ọgaranya ma nke ọzọ bụ ogbenye.
2Onye ọgaranya a nwere ọtụtụ igwe atụrụ na igwe ehi.
3Ma nwoke ogbenye ahụ enweghị ihe ọbụla karịa otu nwa nne atụrụ nta nke ọ zụtara. Ọ zụlitere ya, o tolite nʼetiti ya na ụmụ ya. Ọ na-eri nri site na ihe oriri ya, na-aṅụ mmiri site nʼiko mmiri ya, nʼobi ya ka ọ na-edinakwa. Ọ nọ ọnọdụ dịka nwa nwanyị nye ya.
4“Otu ụbọchị, onye ọbịa bịara nʼụlọ onye ọgaranya ahụ. Ma kama ọgaranya ahụ ga-ewere otu atụrụ maọbụ ehi nke ya siere onye ọbịa ya nri, ọ gara were nne atụrụ ogbenye ahụ, gbuo ya, jiri ya siere ọbịa ya nri.”
5Devid were oke iwe megide nwoke ahụ, ọ sịrị Netan, “Ana m aṅụ iyi nʼaha Onyenwe anyị dị ndụ na onye mere ihe dị otu a aghaghị ịnwụ!