1Ya mere, Onyenwe anyị zigara Netan ka o jekwuru Devid. Mgbe Netan bịakwutere Devid, ọ kọọrọ ya akụkọ a, “E nwere ndị ikom abụọ bi nʼotu obodo, otu bụ ọgaranya ma nke ọzọ bụ ogbenye.
2Onye ọgaranya a nwere ọtụtụ igwe atụrụ na igwe ehi.
3Ma nwoke ogbenye ahụ enweghị ihe ọbụla karịa otu nwa nne atụrụ nta nke ọ zụtara. Ọ zụlitere ya, o tolite nʼetiti ya na ụmụ ya. Ọ na-eri nri site na ihe oriri ya, na-aṅụ mmiri site nʼiko mmiri ya, nʼobi ya ka ọ na-edinakwa. Ọ nọ ọnọdụ dịka nwa nwanyị nye ya.