28Mgbe ahụ, Absalọm nyere ndị na-ejere ya ozi iwu banyere Amnọn sị, “Cherenụ ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, mgbe m sịkwara unu tigbuo ya, unu atụla egwu, tigbuonụ ya. Ọ bụ m na-ekwu ihe ga-eme nʼebe a. Nweenụ obi ike, meekwanụ ya.”
29Mgbe oge ruru, ndị ozi Absalọm tigburu Amnọn. Mgbe ahụ, ụmụ eze niile biliri makwasị nʼịnyịnya ha gbalaga.
30Mgbe ha ka nọ nʼụzọ na-agbaga Jerusalem, ozi eruolarị Devid ntị sị, “Absalọm egbuchaala ụmụ eze niile, ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ!”
31Eze biliri ọtọ, dọwaa uwe ya, daa nʼala, gbatịa onwe ya nʼihi obi ọjọọ. Ndị na-ejere ya ozi dọwakwara uwe ha nʼihi egwu na obi ọjọọ.
32Ma Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid, sịrị, “Onyenwe m, echekwala na e gburu ụmụ ndị ikom eze niile, kama ọ bụ naanị Amnọn! Nke a bụ ihe Absalọm jikere ime site mgbe Amnọn wakporo nwanne ya nwanyị bụ Tama, dina ya.