30Mgbe ha ka nọ nʼụzọ na-agbaga Jerusalem, ozi eruolarị Devid ntị sị, “Absalọm egbuchaala ụmụ eze niile, ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ!”
31Eze biliri ọtọ, dọwaa uwe ya, daa nʼala, gbatịa onwe ya nʼihi obi ọjọọ. Ndị na-ejere ya ozi dọwakwara uwe ha nʼihi egwu na obi ọjọọ.
32Ma Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid, sịrị, “Onyenwe m, echekwala na e gburu ụmụ ndị ikom eze niile, kama ọ bụ naanị Amnọn! Nke a bụ ihe Absalọm jikere ime site mgbe Amnọn wakporo nwanne ya nwanyị bụ Tama, dina ya.
33Ma ugbu a, ka onyenwe m bụ eze ghara itinye akụkọ banyere ọnwụ ụmụ ndị ikom eze niile, nʼobi ya. Ọ bụ naanị Amnọn nwụrụ.”
34Ma Absalọm gbara ọsọ gbalaga. Ọ dịghị anya nwoke na-anọ nʼelu mgbidi Jerusalem na-eche nche, lepụrụ anya hụ ndị mmadụ ka ha si nʼụzọ dị nʼakụkụ ugwu nta na-abịa. Nwoke ahụ gara gwa eze sị ya, “Ahụrụ m ndị si nʼakụkụ Horonaim, nʼakụkụ ugwu na-abịa.”