1Joab, nwa Zeruaya matara na obi eze dị nʼebe Absalọm nọ.
2Joab zigara ozi na Tekoa, si nʼebe ahụ kpọta otu nwanyị maara ihe. Mgbe nwanyị ahụ bịaruru, Joab gwara ya sị, “Mee onwe gị dịka onye na-eru ụjụ. Yiri akwa mkpe, etekwala mmanụ otite. Kpaa agwa dịka nwanyị nọ nʼiru ụjụ ogologo oge.
3Emesịa, jekwuru eze, gwa ya okwu ndị a m na-agwa gị.” Joab tinyere okwu ndị ahụ nʼọnụ ya.
4Mgbe nwanyị ahụ si Tekoa gara na nke eze, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala ịsọpụrụ eze. Ọ sịrị, “Biko nyere m aka, gị onye a na-asọpụrụ!”
5Eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ mkpa gị?” Ọ zara sị, “Abụ m nwanyị isi mkpe, di m anwụọla.