2 Samuel 14

Mgbe nwanyị ahụ si Tekoa gara na nke eze, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala ịsọpụrụ eze. Ọ sịrị, “Biko nyere m aka, gị onye a na-asọpụrụ!”

2 Samuel 14:4 (UKJV) And when the woman of Tekoah spoke to the king, she fell on her face to the ground, and did reverence, and said, Help, O king.

2Joab zigara ozi na Tekoa, si nʼebe ahụ kpọta otu nwanyị maara ihe. Mgbe nwanyị ahụ bịaruru, Joab gwara ya sị, “Mee onwe gị dịka onye na-eru ụjụ. Yiri akwa mkpe, etekwala mmanụ otite. Kpaa agwa dịka nwanyị nọ nʼiru ụjụ ogologo oge.

3Emesịa, jekwuru eze, gwa ya okwu ndị a m na-agwa gị.” Joab tinyere okwu ndị ahụ nʼọnụ ya.

4Mgbe nwanyị ahụ si Tekoa gara na nke eze, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala ịsọpụrụ eze. Ọ sịrị, “Biko nyere m aka, gị onye a na-asọpụrụ!”

5Eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ mkpa gị?” Ọ zara sị, “Abụ m nwanyị isi mkpe, di m anwụọla.

6Enwere m ụmụ ndị ikom abụọ ndị gara lụọ ọgụ nʼọhịa. Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ, o nweghị onye pụtara gboo ha. Nʼihi ya, otu nʼime ha tigburu ibe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.