2 Samuel 14

Enwere m ụmụ ndị ikom abụọ ndị gara lụọ ọgụ nʼọhịa. Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ, o nweghị onye pụtara gboo ha. Nʼihi ya, otu nʼime ha tigburu ibe ya.

2 Samuel 14:6 (UKJV) And your handmaid had two sons, and they two strove together in the field, and there was none to part them, but the one stroke the other, and slew him.

4Mgbe nwanyị ahụ si Tekoa gara na nke eze, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala ịsọpụrụ eze. Ọ sịrị, “Biko nyere m aka, gị onye a na-asọpụrụ!”

5Eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ mkpa gị?” Ọ zara sị, “Abụ m nwanyị isi mkpe, di m anwụọla.

6Enwere m ụmụ ndị ikom abụọ ndị gara lụọ ọgụ nʼọhịa. Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ, o nweghị onye pụtara gboo ha. Nʼihi ya, otu nʼime ha tigburu ibe ya.

7Ma ugbu a, ndị ikwu di m na-esogbu m na-asị ‘Kpọpụta onye ahụ gburu nwanne ya ka anyị gbuo ya nʼihi ndụ nwanne ya o wepụrụ, ka anyị si otu a memilaa onye nke fọdụrụ ga-erita oke ezinaụlọ.’ Ha chọrọ isi otu a menyụọ icheku ọkụ nke fọdụụrụ m, nke bụ na di m agaghị enwezikwa aha maọbụ onye fọdụụrụ ya nʼelu ụwa.”

8Eze sịrị nwanyị ahụ, “Laa nʼụlọ gị, aga m ahụ na o nweghị onye metụrụ ya aka.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.