2 Samuel 15

Mgbe ahụ, Devid tụgharịrị kpọọ Itai, onye Git, ọchịagha narị ndị agha isii ahụ sị ya, “Gịnị mere i ji eso m? Laghachi azụ soro eze Absalọm, nʼihi na ị bụ ọbịa nʼIzrel, onye gbatara ọsọ ndụ.

2 Samuel 15:19 (UKJV) Then said the king to Ittai the Gittite, Wherefore go you also with us? return to your place, and abide with the king: for you are a stranger, and also an exile.

17Eze biliri pụọ, ya na ndị niile so ya, ha kwụsịrị nʼoke ala nke obodo ahụ.

18Ndị niile na-ejere ya ozi, gafere nʼakụkụ ya, ha na ndị Keret na Pelet, na narị ndị ikom isii ndị Git, bụ ndị so ya site na Gat, gafekwara nọrọ nʼihu eze.

19Mgbe ahụ, Devid tụgharịrị kpọọ Itai, onye Git, ọchịagha narị ndị agha isii ahụ sị ya, “Gịnị mere i ji eso m? Laghachi azụ soro eze Absalọm, nʼihi na ị bụ ọbịa nʼIzrel, onye gbatara ọsọ ndụ.

20Ọ dịbeghị anya kemgbe ị bịara. M ga-esi aṅaa kwere ka i soro m na-awagharị, ebe ọ bụ na m amaghị ebe m na-aga. Chịrị ndị agha gị laghachi. Ka obiọma na ikwesi ntụkwasị obi dịnyere unu.”

21Ma Itai zara eze sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, onyenwe m na-adịkwa ndụ, ebe ọbụla onyenwe m bụ eze ga-anọ, ma ọ pụtara ndụ maọbụ ọnwụ, nʼebe ahụ ka odibo gị ga-anọkwa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.