2 Samuel 15

Eze biliri pụọ, ya na ndị niile so ya, ha kwụsịrị nʼoke ala nke obodo ahụ.

2 Samuel 15:17 (UKJV) And the king went forth, and all the people after him, and tarried in a place that was far off.

15Ndị na-ejere ya ozi zara sị ya, “Anyị dịnyere gị! Anyị jikekwara ime ihe ọbụla onyenwe anyị eze kwuru.”

16Ya mere, eze na ndị ụlọ ya niile si na Jerusalem pụọ. Ọ dịghị onye ọ hapụrụ karịakwa ndị iko ya nwanyị iri nʼihi ilekọta obieze ahụ.

17Eze biliri pụọ, ya na ndị niile so ya, ha kwụsịrị nʼoke ala nke obodo ahụ.

18Ndị niile na-ejere ya ozi, gafere nʼakụkụ ya, ha na ndị Keret na Pelet, na narị ndị ikom isii ndị Git, bụ ndị so ya site na Gat, gafekwara nọrọ nʼihu eze.

19Mgbe ahụ, Devid tụgharịrị kpọọ Itai, onye Git, ọchịagha narị ndị agha isii ahụ sị ya, “Gịnị mere i ji eso m? Laghachi azụ soro eze Absalọm, nʼihi na ị bụ ọbịa nʼIzrel, onye gbatara ọsọ ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.