2 Samuel 15

Nʼisi ụtụtụ, ọ na-ebili gaa guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata Jerusalem. Ọ bụrụ na ọ hụ onye ọbụla nwere okwu ọ chọrọ ka eze mara ihe banyere ya, Absalọm na-akpọ onye ahụ jụọ ya sị, “Olee obodo i si bịa?” Onye ahụ na-aza sị, “Ohu gị si nʼotu nʼime ebo dị nʼIzrel.”

2 Samuel 15:2 (UKJV) And Absalom rose up early, and stood beside the way of the gate: and it was so, that when any man that had a controversy came to the king for judgment, then Absalom called unto him, and said, Of what city are you? And he said, Your servant is of one of the tribes of Israel.

1Mgbe nke a gasịrị, Absalọm zụtaara onwe ya ụgbọ agha na ịnyịnya na-adọkpụ ya. O nwetakwaara onwe ya iri ndị ikom ise ndị na-agba ọsọ nʼihu ya.

2Nʼisi ụtụtụ, ọ na-ebili gaa guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata Jerusalem. Ọ bụrụ na ọ hụ onye ọbụla nwere okwu ọ chọrọ ka eze mara ihe banyere ya, Absalọm na-akpọ onye ahụ jụọ ya sị, “Olee obodo i si bịa?” Onye ahụ na-aza sị, “Ohu gị si nʼotu nʼime ebo dị nʼIzrel.”

3Absalọm na-agwa onye ahụ sị, “Ahụrụ m na okwu gị niile bụ eziokwu. Ma ọ na-ewute m na eze enweghị onye na-enyere ya aka ịnụ okwu ndị a niile.”

4Absalọm na-ekwukwa sị, “Asị na m bụ onye ikpe nʼala Izrel, onye ọbụla nwere okwu na ụka gaara abịakwute m ka m mee ka ikpe ziri ezi rute ya aka.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.