22Devid sịrị Itai, “Gaa nʼihu, gabiga.” Ya mere Itai, onye Git gabigara ya na ndị ikom ya niile, na ezinaụlọ niile ndị so ya.
23Obodo niile tiri mkpu akwa mgbe ndị ahụ niile na-agabiga. Eze gafere ọdọ mmiri Kidrọn, ya na ndị mmadụ niile chere ihu nʼụzọ ọzara.
24Zadọk bịakwara, ya na ndị Livayị niile, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ha dọbara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼala. Abịata chụgidere aja tutu ruo mgbe mmadụ niile sitere nʼobodo ahụ gabigasịrị.
25Mgbe ahụ, eze sịrị Zadọk, “Bughachi igbe Chineke a nʼime obodo. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼanya Onyenwe anyị, ọ ga-akpọghachi m mee ka m hụ ya, na ebe obibi ya anya ọzọ.
26Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ihe banyere gị adịghị atọkwa m ụtọ,’ lee m, ya mee m otu o si dị ya mma nʼanya.”