23Obodo niile tiri mkpu akwa mgbe ndị ahụ niile na-agabiga. Eze gafere ọdọ mmiri Kidrọn, ya na ndị mmadụ niile chere ihu nʼụzọ ọzara.
24Zadọk bịakwara, ya na ndị Livayị niile, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ha dọbara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼala. Abịata chụgidere aja tutu ruo mgbe mmadụ niile sitere nʼobodo ahụ gabigasịrị.
25Mgbe ahụ, eze sịrị Zadọk, “Bughachi igbe Chineke a nʼime obodo. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼanya Onyenwe anyị, ọ ga-akpọghachi m mee ka m hụ ya, na ebe obibi ya anya ọzọ.
26Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ihe banyere gị adịghị atọkwa m ụtọ,’ lee m, ya mee m otu o si dị ya mma nʼanya.”
27Mgbe ahụ, eze gwara Zadọk bụ onye nchụaja sị, “Ọkwa ị bụ onye ọhụ ụzọ? Laghachi nʼobodo nʼudo, kpọrọ Ahimaaz nwa gị nwoke, na Jonatan nwa Abịata. Gị na Abịata kpọrọ ụmụ unu ndị ikom abụọ ndị a laghachi nʼobodo.