30Ma Devid na ndị so ya chere ihu irigo Ugwu Oliv. Mgbe ọ na-aga, Devid nọ na-akwa akwa. O yikwaghị ihe ọbụla nʼụkwụ ya, ma o ji ihe kpuchie isi ya. Ndị niile so ya kpuchikwara isi ha na-akwakwa akwa ka ha na-arịgo.
31Mgbe a gwara Devid na Ahitofel onye na-adụ ya ọdụ dịnyere Absalọm, Devid kpere ekpere sị, “O Onyenwe anyị, biko, tụgharịa ndụmọdụ Ahitofel ka ọ bụrụ ndụmọdụ nzuzu.”
32Mgbe Devid bịaruru nʼelu Ugwu Oliv, ebe ndị mmadụ na-anọ na-efe Chineke ofufe, Hushaị, onye Akai nọ nʼebe ahụ na-eche izute ya. Uwe ya dọwakwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi.
33Ma Devid sịrị ya, “Ọ bụrụ na i soro m, ị ga-abụ ibu arọ nye m.
34Ma ọ bụrụ na ị laghachi nʼobodo, sị Absalọm, ‘Aga m abụ ohu gị, eze. Abụ m ohu nna gị nʼoge gara aga, ugbu a aga m abụ ohu gị.’ Nʼụzọ dị otu a ị ga-enyere m aka mebie ndụmọdụ Ahitofel.