34Ma ọ bụrụ na ị laghachi nʼobodo, sị Absalọm, ‘Aga m abụ ohu gị, eze. Abụ m ohu nna gị nʼoge gara aga, ugbu a aga m abụ ohu gị.’ Nʼụzọ dị otu a ị ga-enyere m aka mebie ndụmọdụ Ahitofel.
35Ọ bụ na Zadọk na Abịata ndị nchụaja agaghị eso gị nọdụ nʼebe ahụ? Gwa ha ihe ọbụla ị ga-anụta nʼụlọeze.
36Ụmụ ha ndị ikom, Ahimaaz nwa Zadọk na Jonatan nwa Abịata so ha nọdụ nʼebe ahụ. Zitere m ha ka ha gwa m ihe ọbụla ị nụtara.”
37Ya mere Hushaị, enyi Devid, bịarutere Jerusalem mgbe Absalọm na-abata obodo ahụ.