1Ahitofel gwara Absalọm sị ya, “Kwere ka m họpụta puku ndị ikom iri na abụọ ka m duru ha chụso Devid ọsọ nʼazụ nʼabalị taa.
2Aga m abịakwasị ya mgbe ike gwụrụ ya, mgbe obi ya na-ada mba. Aga m emenye ya egwu nke ga-eme ka ọ maa jijiji. Mgbe ahụ, ndị niile so ya ga-agbasasịkwa. Ọ bụ naanị eze ka m ga-egbu
3Aga m eme ka ndị ya niile lọghachikwute gị. Ọnwụ nke otu nwoke a ị na-achọsi ndụ ya ike ga-eme ndị ọzọ niile ịlọghachikwute gị, onye ọbụla ga-anọ nʼudo.”
4Atụmatụ ahụ ziri ezi nʼanya Absalọm na ndị okenye niile nke Izrel.