2 Samuel 17

Hushaị zara Absalọm sị, “Ndụmọdụ Ahitofel dụrụ nʼoge a adịghị mma.

2 Samuel 17:7 (UKJV) And Hushai said unto Absalom, The counsel that Ahithophel has given is not good at this time.

5Ma Absalọm kwuru sị, “Kpọọ Hushaị onye Akai ka anyị jụọ ya ihe ọ chere banyere okwu a.”

6Mgbe Hushaị bịakwutere ya, Absalọm sịrị ya, “Ahitofel nyere ndụmọdụ dị otu a. Gịnị ka ị chere? Anyị ga-eme ihe o kwuru? Ọ bụrụ na anyị agaghị eme ya, gị onwe gị kwuo nke gị.”

7Hushaị zara Absalọm sị, “Ndụmọdụ Ahitofel dụrụ nʼoge a adịghị mma.

8Ọ sịrị, Gị onwe gị maara nna gị na ndị ikom ya; ha bụ ndị dike nʼagha, mkpụrụobi ha dịkwa ilu ugbu a dịka anụ ọhịa bịa a gbabara aka nwa nʼọhịa. Nna gị bụ onye ihe banyere agha doro anya. Ọ gaghị eso ndị ya nọọ ọnọdụ abalị.

9Ọ bụladị ugbu a, o zoola onwe ya nʼime otu olulu maọbụ nʼime ọgba nkume. Ọ bụrụ na ọ pụta buru ụzọ buso ndị agha gị agha, onye ọbụla nụrụ ya ga-ekwu sị, ‘Etigbuola ndị agha Absalọm oke ntigbu.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.