2 Samuel 17

Ọ bụladị ugbu a, o zoola onwe ya nʼime otu olulu maọbụ nʼime ọgba nkume. Ọ bụrụ na ọ pụta buru ụzọ buso ndị agha gị agha, onye ọbụla nụrụ ya ga-ekwu sị, ‘Etigbuola ndị agha Absalọm oke ntigbu.’

2 Samuel 17:9 (UKJV) Behold, he is hid now in some pit, or in some other place: and it will come to pass, when some of them be overthrown at the first, that whosoever hears it will say, There is a slaughter among the people that follow Absalom.

7Hushaị zara Absalọm sị, “Ndụmọdụ Ahitofel dụrụ nʼoge a adịghị mma.

8Ọ sịrị, Gị onwe gị maara nna gị na ndị ikom ya; ha bụ ndị dike nʼagha, mkpụrụobi ha dịkwa ilu ugbu a dịka anụ ọhịa bịa a gbabara aka nwa nʼọhịa. Nna gị bụ onye ihe banyere agha doro anya. Ọ gaghị eso ndị ya nọọ ọnọdụ abalị.

9Ọ bụladị ugbu a, o zoola onwe ya nʼime otu olulu maọbụ nʼime ọgba nkume. Ọ bụrụ na ọ pụta buru ụzọ buso ndị agha gị agha, onye ọbụla nụrụ ya ga-ekwu sị, ‘Etigbuola ndị agha Absalọm oke ntigbu.’

10Mgbe ahụ, ọ bụladị dimkpa nʼagha ndị nwere obi ọdụm, ụjọ ga-atụkwa ha. Ha agaghị ekwekwa ịga nʼihu ọgụ. Nʼihi na Izrel niile maara na nna gị bụ dike. Ha maakwara na ndị agha ya bụkwa ndị obi kara aka.

11“Ndụmọdụ m na-enye bụ nke a: chịkọtaa ndị Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, ha dịka aja nke dị nʼakụkụ oke osimiri. Ọ bụkwa gị ga-edu ha nʼagha ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.