4Atụmatụ ahụ ziri ezi nʼanya Absalọm na ndị okenye niile nke Izrel.
5Ma Absalọm kwuru sị, “Kpọọ Hushaị onye Akai ka anyị jụọ ya ihe ọ chere banyere okwu a.”
6Mgbe Hushaị bịakwutere ya, Absalọm sịrị ya, “Ahitofel nyere ndụmọdụ dị otu a. Gịnị ka ị chere? Anyị ga-eme ihe o kwuru? Ọ bụrụ na anyị agaghị eme ya, gị onwe gị kwuo nke gị.”
7Hushaị zara Absalọm sị, “Ndụmọdụ Ahitofel dụrụ nʼoge a adịghị mma.
8Ọ sịrị, Gị onwe gị maara nna gị na ndị ikom ya; ha bụ ndị dike nʼagha, mkpụrụobi ha dịkwa ilu ugbu a dịka anụ ọhịa bịa a gbabara aka nwa nʼọhịa. Nna gị bụ onye ihe banyere agha doro anya. Ọ gaghị eso ndị ya nọọ ọnọdụ abalị.