10Otu nʼime ndị ikom ahụ hụrụ ya, kọọrọ Joab, “Lee, ahụrụ m Absalọm ebe ọ kwụ nʼelu osisi ook.”
11Joab sịrị nwoke ahụ onye gwara gị, “Gịnị, ị hụrụ ya? Gịnị mere i tigbughị ya ka o ruo nʼala nʼebe ahụ? Mgbe ahụ, agaara m enye gị shekel ọlaọcha iri, na belịt a na-enye onye bụ dike nʼagha.”
12Ma nwoke ahụ zara sị, “A sịkwarị na e nyere m puku ọlaọcha nʼaka m a, agaraghị m egbu ya. Nʼihi na anyị niile nụrụ mgbe eze na-agwa gị na Abishai na Itai sị, ‘Lezienụ anya banyere nwokorobịa bụ Absalọm, nʼihi m.’
13A sị na m gburu ya, ọ ga-abụ imegide eze. Ọ ga-emesiekwa chọpụta onye mere ya. Ma gị onwe gị agaraghị apụta kwuchite ọnụ m.”
14Joab sịrị, “Ọ bụghị otu a ka m ga na-eche nʼihu gị.” Ya mere, ọ chịịrị ùbe atọ nʼaka ya, dubaa ha nʼobi Absalọm, mgbe Absalọm ka dị ndụ makwụrụ nʼelu osisi ook.