18Nʼoge Absalọm dị ndụ, o wuuru onwe ya ogidi ncheta. O wuru ogidi a na Ndagwurugwu Eze, nʼihi na o chere nʼime onwe ya sị, “Enweghị m nwa nwoke ga-aza aha m.” Ya mere, ọ gụrụ ogidi ahụ aha nke ya onwe ya. Ọ bụkwa Ogidi Absalọm ka a na-akpọ ya ruo taa.
19Mgbe ahụ, Ahimaaz, nwa Zadọk, bịakwutere Joab sị ya, “Biko, ka m gbara ọsọ gaa zie eze oziọma a, na Onyenwe anyị azọpụtala ya site nʼaka ndị iro ya.”
20Ma Joab zara sị ya, “Ọ bụghị gị ga-ezi eze ozi taa. I nwere ike ime ya mgbe ọzọ, ma ọ bụghị taa, nʼihi na nwa eze nwụrụ.”
21Joab gwara otu nwoke onye Kush sị ya, “Gaa gwa eze ihe ị hụrụ.” Nwoke ahụ kpọrọ isiala, gbapụ ọsọ.
22Ahimaaz nwa Zadọk rịọkwara Joab ọzọ sị ya, “Otu ọbụla o si dị, biko kwere ka m gbaso onye Kush a.” Ma Joab zara sị, “Nwa m nwoke, gịnị mere i ji chọọ ị ga? I nweghị ozi ọbụla ị ga-ezi nke ga-ewetara gị ụgwọ ọrụ.”