15Mgbe ahụ, eze lọghachitere na Jọdan. Ndị ikom Juda bịarutere Gilgal izute eze, na ịkpọfeta ya Jọdan.
16Shimei, nwa Gera, onye Benjamin, nwoke ahụ sitere na Bahurim, mere ngwangwa soro ndị ikom Juda pụta izute eze Devid.
17Ya na puku ndị ikom Benjamin sokwa. Ziba, onyeozi Sọl, na ụmụ ya ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ ndị ozi ya, mekwara ngwangwa ịbịarute Jọdan tupu eze erute nʼebe ahụ.
18Ha gabigara mmiri nʼebe ọ dị nta ịkwọfe ndị ụlọeze nʼụgbọ mmiri, na ime ihe ọbụla dị mma nʼanya ya. Mgbe Shimei nwa Gera gafere Jọdan, ọ dara nʼala nʼihu eze,
19sị ya, “Ka Onyenwe m, ghara ịgụkọrọ m njehie m nye m. Echetakwala otu ohu gị si mee ihe nʼezighị ezi nʼụbọchị onyenwe m hapụrụ Jerusalem pụọ. Ka eze ghara itinye ya nʼobi ya,