2 Samuel 2

Ụmụ Zeruaya atọ nọ nʼebe ahụ, ya bụ, Joab, na Abishai na Asahel. Asahel bụ nwoke na-agba ọsọ dịka mgbada.

2 Samuel 2:18 (UKJV) And there were three sons of Zeruiah there, Joab, and Abishai, and Asahel: and Asahel was as light of foot as a wild roe.

16Nwoke ọbụla jidere ibe ya nʼisi were mma agha ya manye ya nʼakụkụ, si otu a wetara onwe ha ọnwụ. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ dị na Gibiọn, Helkat Hazurim, nke pụtara Ala mma agha.

17Agha siri ike dara nʼụbọchị ahụ. Ma ndị agha Devid lụgburu Abna na ndị agha Izrel.

18Ụmụ Zeruaya atọ nọ nʼebe ahụ, ya bụ, Joab, na Abishai na Asahel. Asahel bụ nwoke na-agba ọsọ dịka mgbada.

19Ọ chụwara Abna ọsọ, ọ dịghị mgbe ọ tụgharịrị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe mgbe ọ nọ na-achụ ya ọsọ.

20Mgbe Abna lere anya nʼazụ hụ ya ka ọ na-abịa, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Ọ bụ gị Asahel?” Asahel zara sị, “Ọ bụ m.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.