27Joab zara sị, “Eji m aha Chineke ṅụọ iyi na-asị na ọ bụrụ na i gbara nkịtị, ndị a gaara achụso ụmụnna ha ọsọ na-akwụsịghị ruo nʼụtụtụ echi.”
28Mgbe ahụ, Joab fụrụ opi ike ya. Nke a mere ka ndị ya kwụsị ịchụ ndị Izrel. Ha kwụsịkwara ibu agha.
29Nʼabalị ahụ, Abna na ndị ikom ya jere ije gafee ndagwurugwu Jọdan, gabigakwa osimiri Jọdan, jee ije nʼụtụtụ echi ya tutu ha eruo Mahanaim.
30Joab kwụsịrị ịchụ Abna ọsọ, ọ chịkọtara ndị agha niile. Mgbe ọ gụrụ ha ọnụ, ọ chọpụtara na mmadụ iri na itoolu nʼime ndị ikom Devid, tinyere Asahel nwanne ya, bụ ndị na-alọtaghị agha.
31Ma ndị ikom Devid gburu narị ndị agha Benjamin atọ na iri isii, bụ ndị so Abna.